Mark 15

Jisọs nʼihu Pailet

1Nʼezigbo isi ụtụtụ, ndịisi nchụaja na ndị okenye na ndị ozizi iwu, na ndị nzukọ ndị okenye niile, nwere mkpebi. Ha kere Jisọs agbụ, duru ya nyefee nʼaka Pailet.

2Pailet jụrụ ya sị, “Ị bụ eze ndị Juu?”

Ọ zara sị ya, “Gị onwe gị kwuru ya.”

3Mgbe ahụ ndịisi nchụaja boro ya ebubo banyere ọtụtụ ihe. 4Pailet jụrụ ya ajụjụ ọzọ sị, “Ọ bụ na ị nweghị ọsịsa ọbụla? Lee ọtụtụ ebubo ha na-ebo gị.”

5Ma Jisọs azaghị ihe ọzọ. Nke a juru Pailet anya.

6Ugbu a, ọ bụ omenaala nʼoge mmemme, na a ga-ahapụ otu onye mkpọrọ, bụ onye ha rịọrọ ka a hapụ. 7Nʼoge ahụ kwa, otu nwoke a na-akpọ Barabas nọ nʼụlọ mkpọrọ, ya na ụfọdụ ndị biliri megide isi ọchịchị, ndị gbukwara mmadụ nʼoge ọgbaaghara ahụ. 8Igwe mmadụ gbakọrọ na-arịọ Pailet ka o mezuoro ha omenaala ha.

9Mgbe ahụ ọ jụrụ ha sị, “Unu chọrọ ka m hapụrụ unu eze ndị Juu?” 10Ebe ọ maara na ọ bụ nʼihi ekworo ka ndịisi nchụaja ji nyefee Jisọs nʼaka ya. 11Ma ndịisi nchụaja kpaliri igwe mmadụ ahụ ka ha kwagide ya ka ọ hapụrụ ha Barabas.

12Pailet jụrụ ha ọzọ sị, “Gịnị ka m ga-eme nwoke a unu kpọrọ eze ndị Juu?”

13Ma ha tiri mkpu ọzọ sị, “Kpọgide ya nʼobe!”
Nʼụzọ dị otu a a jụrụ Jisọs Kraịst.


14Ma Pailet jụrụ ha sị, “Ọ bụ nʼihi gịnị? Olee ihe ọjọọ o mere?”

Ma ha tiri mkpu karịa ka ha si eti na mbụ, na-asị, “Kpọgide ya nʼobe!”

15Ma ebe Pailet chọrọ ime ihe ga-atọ igwe mmadụ ahụ ụtọ, ọ hapụụrụ ha Barabas, nyefee ha Jisọs nʼaka ka ha pịa ya ihe ma kpọgidekwa ya nʼobe.

Ndị agha ejiri Jisọs mee ihe ọchị

16Ndị agha ahụ duuru ya pụọ baa nʼime ụlọeze a na-akpọ Pritoriọm. Ha kpọkọtakwara ndị agha ndị otu ha ndị ọzọ. 17Ha yinyere ya uwe mwụda na-acha odo odo, kpukwasịkwa ya okpueze nke e ji ogwu kpaa nʼisi. 18Emesịa, ha malitere na-ekele ya sị, “Ekele, eze ndị Juu.” 19Ha ji osisi kụọ ya nʼisi ọtụtụ mgbe, na-agbụ ya ọnụ mmiri asọ. Ha gbukwara ikpere nʼihu ya, na-akpọ isiala na-enye ya. 20Mgbe ha ji ya mechaa ihe ọchị, ha yipụrụ ya uwe odo odo ahụ, yinyekwa ya uwe nke ya. Emesịa, ha duuru ya pụọ gawa ịkpọgide ya nʼobe.

Mkpọgide Jisọs nʼobe

21Ha zutere otu onye na-agata nʼụzọ, aha ya bụ Saimọn, onye Sirini, bụ nna Alegzanda na Rufọs. Ha manyere ya ka o buru obe ya. 22Nʼikpeazụ, ha duuru Jisọs ruo ebe a na-akpọ Gọlgọta (nke pụtara “ebe okpokoro isi”). 23Ha nyere ya mmanya a gwara máá, ma ọ jụrụ ịṅụ ya. 24Emesịa, ha kpọgidere ya nʼobe, ma kee uwe ya nʼetiti onwe ha site nʼife nza onye ga-enwe nke ọ ga-ewe.

25Ha kpọgidere ya nʼobe nʼelekere itoolu nke ụtụtụ. 26Ha depụtara ebubo ha boro ya kwụba ya nʼelu obe ahụ, nke bụ:

Eze ndị Juu.
27Ha kpọgidekwara ya na ndị ohi abụọ nʼobe, otu nʼaka nri ya, nke ọzọ nʼaka ekpe ya. 28A gụkọtara ya na ndị na-emebi iwu.
Ụfọdụ akwụkwọ na-edebanye okwu ndị a dịka ọ dị nʼakwụkwọ Luk 22:37.
29Ndị mmadụ si nʼebe ahụ gafee fufere isi ha na-ekwutọ ya, na-asị, “Leenụ gị! Onye ga-akwada ụlọnsọ ma wugharịa ya nʼabalị atọ. 30Zọpụtanụ onwe gị! Si nʼelu obe ahụ rịdata.” 31Ọ bụladị ndịisi nchụaja, na ndị ozizi iwu na ndị ode akwụkwọ nọ na-akwa ya emo nʼetiti onwe ha na-asị, “Ọ zọpụtara ndị ọzọ, ma ọ pụghị ịzọpụta onwe ya! 32Ka Kraịst a, bụ Eze Izrel, si nʼelu obe a rịdata ka anyị hụ ma kwerekwa.” Ndị ahụ a kpọgidekọrọ ha na ya nʼobe nọkwa na-akparị ya.

Ọnwụ Jisọs

33Mgbe ọ kụrụ elekere iri na abụọ nke ehihie, ọchịchịrị gbachikọtara nʼala ahụ niile. Ọchịchịrị a dịgidere ruo nʼelekere atọ nke ehihie. 34Nʼelekere atọ nke ehihie, Jisọs tiri mkpu akwa nʼoke olu sị, “Elọi, Elọi, lama sabaktani!” (nke pụtara, “Chineke m, Chineke m, gịnị mere i jiri hapụ m?”). c

35Ma ụfọdụ ndị guzo nso nʼebe ahụ, mgbe ha nụrụ nke a, sịrị, “Lee, ọ na-akpọ Ịlaịja!”

36Ya mere, otu onye gbaara ọsọ gaa weta ogbo, denye ya nʼime mmanya gbara ụka, fanye ya na okporo osisi, nye ya ka ọ ṅụọ, ma na-asị, “Hapụnụ ya, ka anyị lee ma Ịlaịja ọ ga-abịa tọtuo ya.”

37Ma Jisọs tiri mkpu nʼolu ike, kubie ume.

38Akwa mgbochi nke ụlọnsọ ukwu sitere nʼelu gbawaa abụọ ruo nʼọnụ ala ala ya. 39Mgbe ọchịagha guzo nʼihu ya, hụrụ otu o si kubie ume, o kwuru sị, “Nʼezie, nwoke a bụ Ọkpara Chineke.”

40O nwere ụfọdụ ụmụ nwanyị guzo nʼebe dị anya na-ele ihe na-eme, nʼetiti ha bụ Meri Magdalin, Meri nne Jemis nke nta, na Josef,
Nʼasụsụ Griik Joses bụkwa Josef.
na Salomi.
41Ndị a bụ ndị naara eso ya na-ejekwara ya ozi, mgbe ọ nọ na Galili. Ọ dịkwa ndị inyom ọzọ nọkwa nʼebe ahụ, bụ ndị sooro ya bịa na Jerusalem.

Olili Jisọs

42Nʼoge uhuruchi (ya bụ ụbọchị na-abọta ụbọchị izuike), ebe ọ bụ Ụbọchị Nkwadebe, 43Josef onye Arimatia, otu nʼime ndị otu nʼụlọ nzukọ, onye a na-asọpụrụ, onye na-echere ọbịbịa nke alaeze Chineke, ji obi ike jekwuru Pailet rịọ ya ka o bunye ya ahụ Jisọs. 44Ọ juru Pailet anya ịnụ na ọ nwụọla. Ọ kpọrọ ọchịagha ahụ jụọ ya ma ọ nwụọla. 45Mgbe ọchịagha ahụ gwara ya na ọ nwụọla, o kwere ka Josef buru ahụ ya. 46Josef zụtara akwa ọcha linin, wedata ahụ ya jiri akwa ahụ fụchie ya. O buuru ya buba ya nʼime ili nke o gwuru nʼime nkume. Emesịa o nuketara otu nkume buru ibu, jiri ya mechie ọnụ ụzọ ili ahụ. 47Meri Magdalin na Meri nne Josef hụkwara ebe e bubara ahụ ya.

Copyright information for IboBIU